Isaiah 1

1Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda.

Mba na-enupu isi

2Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa!
Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu:
“Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha,
ma ha enupula isi megide m.
3Ehi maara onyenwe ya,
ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri,
ma Izrel amaghị m,
ndị m adịghị aghọtakwa.”

4Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie,
ndị ajọ omume riri ahụ,
ụmụ ndị ajọ omume,
ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ!
Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ,
ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel,
ha agbakụtala ya azụ ha.

5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe?
Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi?
Lee ọnya juru unu isi,
leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.
6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke,
site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu;
ọnya, na ntihịa ahụ,
na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ;
e kechikwaghị ha,
e tekwaghị ha mmanụ.

7Ala unu tọgbọrọ nʼefu,
agbaakwala obodo unu ọkụ.
Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu
nʼihu unu,
ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.
Amaokwu a na-akọwa ihe mere nʼoge ndị agha Asịrịa busoro ha agha mgbe eze Senakerib na-achị 2Ez 18:13

8Ada Zayọn ka a hapụrụ
dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị,
dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba,
dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.
9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.

10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-achị Sọdọm;
geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị,
unu ndị Gọmọra.
11“Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja,
gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?”
ka Onyenwe anyị sịrị.
“Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile
nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ;
Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi
adịghị atọkwa m ụtọ.
12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m,
onye chọrọ nke a nʼaka unu?
Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
13Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi.
Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ.
Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile,
apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru.
14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ
a kara aka asị.
Ha bụụrụ m ibu arọ,
ike agwụkwala m ibu ha.
15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere,
agaghị m aṅa unu ntị;
ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,
agaghị m aṅa ntị.”

Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!

16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha.
Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m;
kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,
nyerenụ ndị a na-emegbu aka.
Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,
ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.

18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,”
bụ ihe Onyenwe anyị na-asị.
“A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie,
ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,
Ihe ndị ọcha na-akpọ snoo.

a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie,
ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi,
aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,
ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi
aghọọla onye akwụna!
Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi;
ezi omume na-anọbu nʼime ya,
ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.
22Ọlaọcha gị aghọọla unyi,
ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.
23Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi,
ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi,
onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya,
na-agbasokwa onyinye.
Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna
ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.

24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị,
“Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m,
ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
25Aka m ga-abịakwasị unu.
Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo,
si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.
26Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ.
Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu
Obodo Ezi Omume,
Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”

27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn.
Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi;
ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.

29“Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile
obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha.
Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ
unu jiri aka unu họrọ.
30Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ
maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.
31Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ;
ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ
nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu.
Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”
Copyright information for IboBIU